Isaiah 27

Mgbapụta dịrị Izrel

1Nʼụbọchị ahụ,

Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya
iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike,
taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ.
Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ;
ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.
2Nʼụbọchị ahụ,

abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.
3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya,
ana m agba ya mmiri ụbọchị niile,
na-eche ya nche ehihie na abalị.
Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.
4Adịghị m ewekwa iwe.
Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba,
aga m ebili buso ha agha,
aga m esurekwa ha ọkụ.
5Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa,
ha bịa ka mụ na ha mee udo.
E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.”

6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ.
Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru,
jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile.

7 Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ
dịka o si taa ndị iro ya.
O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya
dị ka e si gbuo ndị iro ha.
8 Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ.
Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ
ka o ji bupụ ha.
9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb,
nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya:
Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha
dịka ntụ,
mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera,
na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.
10Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala.
Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri,
ebe ha na-amakpu na-ezu ike.
Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.
11Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa,
ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ.
Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta.
Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere.
Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.
12Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu. 13Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.

Copyright information for IboBIU